Nyere aka na akaụntụ m mebiri emebi

Ọ bụrụ na emebiela akaụntụ gị mana ị ka nwere ike ịbanye, peeji a ga-enyere gị aka ịchekwa akaụntụ gị wee kwụsị omume ndị achọghị. 

 

E mebiela akaụntụ m?


Ị:

  • Chọpụtara Twiit gasi a na-atụghị anya ya sitere na akaụntụ gị
  • Hụrụ Ozi Òzugbo a na-atụghị anya ya ezitere site na akaụntụ gị
  • Hụla omume akaụntụ ndị ọzọ ị meghị ma ọ bụ kwado (dị ka iso, ikwusi iso, ma ọ bụ igbochi)un
  • Nwetara nziọkwà sitere n'aka anyị na-ekwu na enwere ike imebi akaụntụ gị
  • Nwetara nziọkwà n'aka anyị na-ekwu na ozi sitere na akaụntụ gị agbanweela, ma ị gbanweeghị ya
  • Chọpụtara na okwuntụghe gị anaghịzi arụ ọrụ ma a na-akpali gị ka ịtọgharịa ya

 

Ọ bụrụ na ị zara ee na nke ọ bụla n'ime ihe ndị a dị n'elu, biko mee ihe ndị a:


1. Gbanwee okwuntụghe gị

Biko gbanwee okwuntụghe gị ozugbo site na taabụ Okwuntụghe dị na ntọala. Ọ bụrụ na ịpụọla, gaa na Nbanye wee pịa Chefuru Okwuntụghe ka ịtọgharịa okwuntụghe gị. Biko họrọ okwuntụghe siri ike ị na-ejibeghị mbụ. 

2. Gbaa mbọ hụ na echekwara adreesị ozi-e gị

Hụ na adreesị ozi-e nke etinyere na akaụntụ gị nwere nchebe yana na ọ bụ naanị gị nwere ike ịnweta ya. Ị nwere ike ịgbanwe adreesị ozi-e gị site na ngwa X gị (iOS ma ọ bụ Android) ma ọ bụ site na ịbanye na X.com na ịga na taabụ ntọala Akaụntụ. Gaa na akụkọ a maka ntuziaka maka imelite adreesị ozi-e gị, wee hụ akụkọ a maka ndụmọdụ nchekwa akaụntụ ozi-e ndị ọzọ.

3. Kagbuo njikọ na ngwa ndi-ọbịa

Mgbe ị banyere, gaa na Ngwa na ntọala gị. Kagbuo ohere maka ngwa onye-ọbịa ọ bụla ị na-amaghị.

4. Melite okwuntụghe gị n'ime Ngwa ndi-ọbịa itụkwasịrị obi

Ọ bụrụ na ngwa mpụga atụkwasịrị obi na-eji okwuntụghe nke X gị, hu na imelitere okwuntụghe gị na ngwa ahụ. Ma ọ bụghị ya, enwere ike kpọchie gị na akaụntụgị nwa oge n'ihi mbọ nbanye dara ada.

Akaụntụ gị kwesịrị ịnwe nchekwa ugbu a, ma ị gaghị ahụkwa omume akaụntụ a na-atụghị anya ya ka ọ na-aga n'ihu. Ọ bụrụ na ị ka na-enwe nsogbu, biko tinye arịrịọ nkwado maka enyemaka.
 

5. Kpọtụrụ Nkwado ma ọ bụrụ na ị ka chọrọ enyemaka

Ọ bụrụ na ịnweghị ike ịbanye mgbe ị nwara ịtọgharịa okwuntụghe, kpọtụrụ anyị site n'itinye arịrịọ nkwado. Jide n'aka na ị na-eji adreesị ozi-e ị jikọtara na akaụntụ X emebịrị;  anyị ga-eziga ozi ndị ọzọ na ntuziaka gasi na adreesị ozi-e ahụ. Mgbe ị na-enyefe arịrịọ nkwado gị biko tinye ahaojiarụ gị yana ụbọchị ikpeazụ ị nwetara ohere ibanye na akaụntụ gị.


Mụtakwuo maka ihe ị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị nweghị ohere ịbanye akaụntụ ozi-e jikọtara na akaụntụ X gị.

 

Jiri nlezianya dị mfe chebe akaụntụ gị


Ọ bụrụ na emebiela akaụntụ gị, kpachara anya n'ihe ndị a:

  • Hichapụ Twiit ọ bụla gasi i na-achọghị nke ebisara mgbe akaụntụ gị nwere mmebi.
  • Nyochaa kọmputa gị maka nje virus na malware, ọkachasị ma ọ bụrụ ọ na aga n'ihu ka na ebipute omume akaụntụ na-enwetaghị ikike mgbe ị gbanweela okwuntụghe.
  • Wụnye ihe ntachi nke nche maka sistemụ arụmọrụ na ngwa gị gasi.
  • Na-eji okwuntụghe ọhụrụ siri ike mgbe niile ị na-adịghị eji ebe ọzọ, nke ga-esikwa ike ịkọ.
  • Tụlee iji nyocha ihe abụọ. Kama ịdabere na naanị na-okwuntụghe, nkwadoeziokwu maka nbanye na-ewebata nlele nke abụọ iji jide n'aka na gị na naanị gị nwere ike ịnweta akaụntụ X gị.  Ọ bụ ihe nchebe dị oke mkpa nke na-agbakwunye nchebe ọzọ na akaụntụ gị ma belata ihe ize ndụ nke ịnweta ikike n'enweghị ikike.
  • Ekekọrịtala nye onye ọ bụla ozi nbanye gị dịka usoro kachasị mma iji belata ihe imebi akaụntụ ahụ.

Ị nwere ike ịchọta ozi ndị ọzọ na peeji ndụmọdụ nchekwa akaụntụ anyị.

 

Kedu ka esi emebi akaụntụ? 


Enwere ike imebi akaụntụ ma ọ bụrụ na ị nyefere ahaojiarụ na okwuntụghe gị na ngwa onye-ọbịa ma ọ bụ weebụsaịtị ọjọọ, ma ọ bụrụ na akaụntụ X gị adịghị ike n'ihi okwuntụghe na-adịghị ike, ma ọ bụrụ na nje ma ọ bụ malware na kọmputa gị na-anakọta okwuntụghe, ma ọ bụ ọ bụrụ na ị banye na netwọk mebiri emebi.

Mmelite ndị a na-atụghị anya ya anaghị apụta mgbe niile na emebiela akaụntụ gị n'ike. Mgbe ụfọdụ, ngwa onye-ọbịa nwere ike ịnwe nje na-akpata omume a na-atụghị anya ya. Ọ bụrụ na ị hụ omume dị iche, ịgbanwe okwuntụghe gị na/ma ọ bụ ịkagbu njikọ ga-akwụsị ya, n'ihi na ngwa ahu agaghịzi enwe ohere na akaụntụ gị.

Ọ kacha mma ịme ihe ozugbo enwere ike ma ọ bụrụ na mmelite na-apụta na akaụntụ gị nke ị biputeghị ma ọ bụ kwado. 

Kesaa akụkọ ederede a