Otu esi ewepụ̀ ike na akaụntụ gị

Ị na-eme ezumike na X? Anyị nwetara ya. Mgbe ụfọdụ, ọ dị mma ịlaghachi azụ n'ihe niile na-eme. Ma ọ bụ ọ bụrụ na ị na-achọ ezumike na-adịgide adịgide, anyị nwekwara ike inyere gị aka. Soro ntuziaka anyị site na nzọụkwụ maka otu esi ewepụ̀ ike—ma ọ bụ hichapụ- akaụntụ X gị.

Mara: Ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu akaụntụ (dịka ọmụmaatụ Twiit gasi na-efuna-eso ụzọ ezighi ezi ma ọ bụ onu ogugu isoOzi Òzugbo a na-enyo enyo ma ọ bụ imebi akaụntụ gị), iwepụ na ịtogharị akaụntụ gị agaghị edozi ya. Biko rụtụ aka na akụkọ nsogbu anyị ma ọ bụ kpọtụrụ Nkwado X.

 

Nwepụ̀ ike vs ihichapụ akaụntụ Twitter gị

Iwepụ̀ ike na akaụntụ Twitter gị bụ nzọụkwụ mbụ iji ihichapụ akaụntụ gị kpamkpam. Mwepụ̀ ike na-ewe ụbọchị 30. Ọ bụrụ na ịbanyeghị na akaụntụ gị n'ime oge mwepụ̀ ike nke ụbọchị 30, a na-ehichapụ akaụntụ gị, a gaghịkwa ejikọta ahaojiarụ gị na akaụntụ gị.
 

 

Na-ewepụ̀ ike na akaụntụ Twitter gị

Mwepụ̀ ike na-amalite usoro ihichapụ akaụntụ Twitter gị kpamkpam. Nzọụkwụ a na-amalite windo ụbọchị 30 nke na-enye gị oghere ikpebi ma ị ga-achọ ịtogharị akaụntụ gị.

Iwepụ̀ ike na akaụntụ Twitter gị pụtara na agaghị elele ahaojiarụ gị (ma ọ bụ "ebenjìaka") yana profaịlụ ọha gị na twitter.com, Twitter maka iOS ma ọ bụ Twitter maka Android. 
 

 

Na-ehichapụ akaụntụ Twitter gị

Mgbe windo ụbọchị mwepụ̀ ike 30 gị gachara, a na-ehichapụ akaụntụ Twitter gị kpamkpam. Mgbe ịbanyeghị na akaụntụ gị n'oge windo ụbọchị 30, ọ na-eme ka anyị mara na ịchọrọ ihichapụ akaụntụ Twitter gị kpamkpam. Ozugbo ehichapụrụ akaụntụ gị, akaụntụ gị adịkwaghị na sistemụ anyị. Ị gaghị enwe ike ịtogharị akaụntụ mbụ gị ma ị gaghị enwe oghere ịnweta Twiit ochie ọ bụla gasi.

Ozugbo ewepụrụ ike na akaụntụ gị ka windo nkwụsị nke ụbọchị 30 gasịrị, aha njirimara gị ga-adị maka ndebanye aha site na akaụntụ Twitter ndị ọzọ.

 

Ihe kacha mma ị ga-ama tupu iwepuike na akaụntụ gị

Nke a bụ ihe ole na ole ị ga-eburu n'uche ma ọ bụrụ na ị kpebiela iwepụ̀ ike ma ọ bụ hichapụ akaụntụ Twitter gị:

  • Ihichapụ akaụntụ Twitter gị agaghị ehichapụ ozi banyere gị na igwe ọchụchọ dị ka Google ma ọ bụ Bing n'ihi na Twitter anaghị ejikwa saịtị ndị ahụ. Enwere usoro ị ga-eme ma ọ bụrụ na ịkpọtụrụ igwe nchọta.
  • Mgbe ị ịwepụ̀ru ike na akaụntụ Twitter gị, mkpọrọahà nke ahaojiarụ akaụntụ gị na Twiit ndị ọzọ ka ga-adị. Agbanyeghị, ọ gaghị ejikọta na profaịlụ gị n'ihi na profaịlụ gị agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka enyocha ọdịnaya n'okpuru Iwu gasị Twitter, ị nwere ike tinye akwụkwọ tiketi ebe a.
  • Ịkwesighi ihichapụ akaụntụ gị ka ị gbanwee aha ahaojiarụ ma ọ bụ ozi-e jikọtara na akaụntụ Twitter gị. Gaa na oziAkaụntụ ka imelite nke ahụ oge ọ bụla.
  • Ịbanye n'ime akaụntụ gị n'ime nkwụsị nke ụbọchị 30 na-eweghachi akaụntụ gị ngwa ngwa.
  • Ọ bụrụ na ịchọrọ ibudata data Twitter gị, ị ga-arịọrịrị ya tupu ị wepụ̀ ike na akaụntụ gị. Ịwepụ̀ ike na akaụntụ gị anaghị ewepụ data na sistemụ Twitter.
  • Twitter nwere ike idowe ụfọdụ ozi na akaụntụ gị ewepụ̀rụ̀ ike iji hụ maka nchekwa na nchebe nke ikpo okwu ya na ndị mmadụ na-eji Twitter. Enwere ike ịchọta ozi ndị ọzọebe a.
     

Ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu ijikwa akaụntụ Twitter gị, lelee ndụmọdụ ndị a maka ijikwa okwu nkịtị tupu ịhọrọ ihichapụ akaụntụ Twitter gị.

 
Otu esi ewepụ̀ ike na akaụntụ gị
Step 1

Kpatụakara menu nsoroụzọ , wee kpatụ Ntọala na nzuzo.

Step 2
Step 3

Gụọ ozi mwepụ̀ ike na akaụntụ, wee kpatụ Wepụ̀ ike.  

Step 4

Tinye okwuntụghe gị mgbe akpaliri wee kpatụ Wepụ̀ ike.

Step 5

Gosi na ịchọrọ ịga n'ihu site na kpatụ Ee, Wepụ̀ ike.

Step 1

N'elu ebe nchịkọta nhọrọ, ị ga-ahụ akara ngosi ebe nchịkọta nhọrọ nsoroụzọ  ma ọ bụ akara ngosi profaịlụ gị. Kpatụ akara ngosi ọ bụla ị nwere, ma kpatụ Ntọala na nzuzo.

Step 2
Step 3

Gụọ ozi mwepụ̀ ike na akaụntụ, wee kpatụ Wepụ̀ ike.  

Step 4

Tinye okwuntụghe gị mgbe akpaliri wee kpatụ Wepụ̀ ike.

Step 5

Gosi na ịchọrọ ịga n'ihu site na kpatụ Ee, Wepụ̀ ike.

Step 1

Pịa akarangosi Ndị ọzọ  wee pịa Ntọala na nzuzo  site na menu ndọpụta.

Step 2
Step 3

Gụọ ozi mwepụ̀ ike na akaụntụ, wee pia Wepụ̀ ike

Step 4

Tinye okwuntụghe gị mgbe kpaliri ya na kwenye na ịchọrọ ịga n'ihu site na ịpị  Wepụ̀ ike na akaụntụ bọtịnụ.


Ọ bụrụ na ịchọta na ị na-atụ uche X ma ọ erughị ụbọchị 30, soro usoro ndị a banye naanị iji togharịa akaụntụ gị.
 

 

Ndebanye aha na iwepụ̀ ike na akaụntụ 

Iwepụ ike na akaụntụ X gị anaghị akagbu Ndebanye aha X akpaghi aka. Ọ bụrụ na ị nwere ndebanye aha akwụrụ ụgwọ ọ bụla (dịka, X Blue, Nsoro gasị Kaikē) azụtara site na ngwa X, ha ga-anọgide na-arụ ọrụ. Ị nwere ike ijikwa ndenye aha ndị a site na ikpo okwu ebe ị si debanye aha na mbụ. Ndebanye aha ndị azụrụ na X.com ga-akagbu ozugbo mgbe ị wepụ̀rụ̀ ike na akaụntụ gị.

Otu esi ewepụ ndebanye aha X Blue

Otu esi ewepụ ndebanye aha nsoro gasị Kaikē

 

FAQs Mwepụ̀ ike

Iwepụ̀ ike na Twitter ọ na-ehichapụkwa ozi òzugbo m?

N'ime oge mwepụ̀ ike nke ụbọchị 30, agaghị ehichapụ ozi òzugbo gị. Mgbe oge mwepụ̀ ike ọrụ kwụsịrị ma ehichapụ akaụntụ gị, a ga-ehichapụkwa ozi òzugbo ị zigara.

E wepụ̀rụ̀ m ike na akaụntụ m, mana gịnị kpatara ọ na-eji na-emegharị?

Ọ bụrụ na ị nyere ikike ngwa ndị ọbia ọ bụla ịnweta akaụntụ gị, ị nwere ike isi na ngwa ọzọ na-abanye na-akpaghị aka. N'ihi na ịbanye na Twitter na-emegharị akaụntụ gị ịdịìrè na-akpaghị aka, jide n'aka ị kagbu nweta ngwa ndị ọbia na akaụntụ Twitter gị.

Gịnị ga eme ma ọ bụrụ na enweghị m okwuntụghe m mgbe m na-agbalị iwepụ̀ ike?

Ọ bụrụ na ịnweghị ya na-aka, ma ọ bụ na ị na-enweta ozi na ọ dị njọ, ị nwere ike ịtọgharịa okwuntụghe gị. Gbalịa ịrịọ nrụpụta ozi-e maka ịtọgharị okwuntụghe.

Arịọrọ m ozi-e nrụpụta okwuntụghe, mana gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na enwetaghị m ohere ịnweta adreesị ozi-e m nke m ji melite akaụntụ m?

Ọ bụrụ na ị tufuo ịnweta adreesị ozi-e gị nke ejikọrọ na akaụntụ Twitter gị, ị ga-achọ ịkpọtụrụ onye na-ahụ maka ọrụ email gị. Nweta enyemaka na ịnweta adreesị ozi-e gị. Mwepụ̀ ike bụ ihe omume nke onye ji akaụntụ akwadoro ga-emerịrị ma ọ bụ site na arịrịọ nke onye nwe akaụntụ enwetara. Naani ma ị nwere ike ịkpọtụrụ anyị site na adreesị ozi-e ekwenyesiri ike (ma ọ bụ nwee ike ịnweta akara ekwentị e mere nkwadoeziokwu na akaụntụ ahụ), anyị enweghị ike wepụ̀ ike na akaụntụ ahụ n'aha gị. Ọ bụrụ na ị nwere oghere inweta akara ekwentị mkpanaaka emere nkwadoeziokwu na akaụntụ gị, mgbe ahụ ị nwere ike  rịọ maka nrụpụta okwuntụghe.

Kedu otu m ga-esi wepụ̀ ike akaụntụ m akpọchiri ma ọ bụ kwụsịtụrụ?

Iji wepụ̀ ike na akaụntụ gị a kwụsịtụrụ ma ọ bụ akpọchiri akpọchi, biko nyefee arịrịọ ebe a. A pụkwara iziga arịrịọ nye ndị kọntaktị e depụtara n'okpuru ngalaba nglaba "Otu Esi Akpọtụrụ Anyị" nke Iwu Nzuzo anyị.

Ị nwekwara ike nweta enyemaka imeghe akaụntụ gị. Nweta ozi ndị ọzọ maka ijikwa akaụntụ gị akpọchiri ma ọ bụ kwụsịtụrụ, gụnyere itinye akwụkwọ mkpesa.

Kesaa akụkọ ederede a